Ọrịa mamịrị AỌrịa mamịrị A
![]() Ọrịa mamịrị A (akpọburu ọrịa mamịrị na efe efe) bụ ọrịa na efe efe gara aga nke umeju nke nje ọrịa mamịrị A na ebute (HAV).[1] Ọtụtụ nsogbu nwere obere ma ọ bụ ihe mgbanwe na adịghị ncha ncha n’ebe ndị etolite nọ.[2] Oge dị n’etiti ibute ọrịa a yana ihe mgbanwe, n’ime ndị na ebuwanye, bụ n’etiti izu abụọ na isii.[3] Mgbe enwere ihe mgbanwe ha na anọkarị izu asatọ, ha nwere ike ịgụnye: ajụ, ịgbọ agbọọ, afọ ọsịsa, ọchananya|anụahụ edo-edo, ịba, afọ mgbu.[2] N’ime 10-15% nke ndị mmadụ na enwe nlaghachite nke ihe mgbanwe n’oge ọnwa isii ka enwechara mbute ọrịa ahụ izizi.[2] Mbibi umeju dị gara gara nwere ike ime oge ụfọdụ, a na ahụkarị nke a n’ebe ndị okenye nọ.[2] A na ekesakarị ya site na iri nri ma ọ bụ ịṅụ nri ma ọ bụ mmiri nwere nsị bu ọrịa.[2] Azụ okpokoro nke esibeghị nke ọma bụkwa ebe ọzọ ama ama esi ebute ya.[4] Enwekwara ike ịkesa ya site na ịmetụta onye bụ ọrịa ahụ.[2] Ebe ụmụaka anakarị enwe ihe mgbanwe mgbe ha butere ọrịa ahụ ha ka nwere ike ibunye ndị ọzọ ọrịa ahụ.[2] Ka ebutechara ọrịa otu oge, onye ahụ agaghịzị enweta ọrịa ahụ ọzọ na ndụ ya niile.[5] Ịchọpụta nsogbu chọrọ inyocha ọbara dị ka ihe mgbanwe ndị ahụ yitere ọnụọgụ nke ọrịa ndị ọzọ.[2] Ọ bụ otu n’ime ise ama ọrịa mamịrị nje: A, B, C, D, yana E. Ọgwụ mgbochi ọrịa mamịrị dị mma maka mgbochi.[2][6] Ụfọdụ obodo na akwado ya maka ụmụaka yana maka ndị nwere nnukwu ohere ibute ya ndị na agbabeghị ọgwụ mgbochi.[2][7] O gosiri na ọ dị mma maka ndụ.[2] Ụkpụrụ mgbochi ndị ọzọ gụnyere ịsacha aka yana isi nri nke ọma.[2] Enweghị ọgwụgwọ ọ bụla ama ama, iji ezumike na ịṅụ ọgwụ maka ajụ ma ọ bụ afọ ọsịsa akwadoro dị ka otu esi chọọ ya.[2] Mbute ọrịa na ala kpamkpam na enweghị ọrịa umeju na aga aga.[2] Ọgwụgwọ nke mbibi umeju dị gara gara, ọ bụrụ na ọ dapụta, bụ mbufe umeju.[2] Na gburugburu ụwa okwu ihe mgbanwe nde 1.5 na eme kwa afọ[2] na abụkarị imirikiti nde nke mbute ọrịa na nchịkọta.[8] Ọ na adịkarị na mpaghara nke ụwa nwere gburugburu jọrọ njọ, na enweghị mmiri dị mma zuru oke.[7] Na ụwa na etolite etolite ihe dị ka 90% nke ụmụaka ebutela ọrịa n’ebe afọ 10, ebe ọ dị otu ahụ ha enweela mgbochi na okenye.[7] Ọ na emekarị na mberede n’obodo ndị tolitere nke ọma ebe anaghị ekpughepu ụmụaka mgbe ha dị ntakịrị, ma enweghị ịnye ọgwụ mgbochi n’ala niile.[7] Na 2010, ọrịa mamịrị dị gara gara dapụtara na ọnwụ 102,000.[9] Ụbọchị Ọrịa Mamịrị N’ụwa na eme kwa afọ na Julaị 28 iji mee ka amara ọrịa mamịrị nje na ebute.[7] Lee nke ozoNrụtụ aka
Information related to Ọrịa mamịrị A |
Portal di Ensiklopedia Dunia